Ufodu Ndi Mmadu Anwuola Na Ihe Mberede Okporo Uzo Mere Ohuru Na Ebonyi State
Written by admin on June 7, 2026
by Maduabuchi Onwe
Opekata mpe mmadu ise etufuola ndu ha ebe mmadu iri na abuo ndi ozo nwetere nnukwute ihe mmeru aru na ihe mberede okporo uzo mere na uzo awara awara ahu siri Nkalagu nke Ebonyi State gawa Enugu state na ubochi Friday.
Yabu ihe mberede okporo uzo ka ozi mere ka amata na omere kpom kwem na akwa mmiri Edema nke dina lshielu local government area oge otu onye okpo ugboala mkpata ego buu mmadu iri na asaa wee na agba wam wam na okporo uzo site Abakaliki bu isi obodo Ebonyi state wee na aga Enugu state.
Nke a putara ihe site na ozi onye sector Commander nyere ulo olu na ahu maka njem awele okporo uzo na Nigeria bu Federal road safety corps FRSC bu Daniel Asanya nyefere ndi nta akuko taata bu Sunday na state ahu.
Ogakwara na iru mee ka amata na umu nwoke ano gunyekwara otu obere nwata nwaanyi nwuru na yabu ihe mberede, ebe mmadu iri na abuo ndi ozo noo na onodu odi ndu onwu kama na ulo ogwu Annunciation hospital nke dina Enugu state ebe ha na anara ogwugwo ka odi ugbu a.
Na ikpazu ka ha doro aka na nti gara ndi okpo ugboala ka ha wepu aka ha kpam kpam na ihe obuna ga ebute ha igba wam wam wam na okporo uzo maka na obu eje ala bu isi ije.