Ndị ekperima egbuola otu nwa agbọghọ dị naanị afọ iri na isii na Ekiti state n’oge ọ jụrụ na ha agaghị akwaso ya iko n’ike.

Written by on February 11, 2025

Ụmụ nwoke abụọ ana atụ anya na ha bụ ndị na-achị ehi edulala otu obere nwa agbọghọ dị afọ iri na isii mmụọ n’ike na Ekiti state kworo maka na ọ jụrụ jụwa isi na ha agaghị akwaso ya iko n’ike.

Dịka akụkọ ahụ siri kọọ na ya bụ ihe mere n’oge nwa agbọghọ ahụ ana akpọghi aha ya gara n’ugbo ha dina Emure Ekiti nke council ime obodo Emure yana nwanne ya nwoke.

N’oge ahụ ka ụmụ nwoke abụọ ahụ nọrọ chebiri ha n’akụkụ okporo ụzọ. Mana nwanne ya nwoke riri mbọ mbọ ọsọ ozugbo ọ hụrụ ha ebe nke nwaanyị ka ụmụ nwoke abụọ ahụ jidere ma mechaa wee gbuo ya n’oge ọ jụrụ na ha agaghị ejiri ya were racha piom.

Ka ọ dị ugbu a, ya bụ ozi kana ekwu na anwụchiela mmadụ abụọ ana atụ anya na ọ bụ ha kpara ya bụ arụ.

Na mgbe ndị nta akụkọ kpọtụrụ onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe ojii na Ekiti state bụ SP Sunday Abutu ka o mere ka amata na ya ozi ruru ha ntị ebe ya ga-emecha kpupe ọnụ were gwa ọhaneze ka ya bụ ihe siri mee.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies