Aka Akpatala Nwoke Kpara Agwa Nwankita Na Abia State

Written by on September 17, 2024

Aka ndi nchekwa Nigerian Security and Civil Defence Corps NSCDC ngalaba ya nke Abia State akpatala otu nwoke gbara afo iri isii na ano bu mazi Nnanna Michael kwere maka ebubo inwe ogige ebe ana amusisiri ya umuaka n’ uzo megidere iwu amara n’ olu bekee dika Illegal Baby Factory.

Nwoke a bu nwa afo obodo Obinkita nke Arochukwu ka ana ebokwu ebubo itu mgbere umuaka.

Nke a bu dika obuna ogige yabu Illegal Baby Factory dina Abanafo street nke Ariaria na mpaghara Aba ka aka ndi nchekwa Civil Defence gaara kpata nwoke a na ngwucha izu uka gara aga.

Ndi nchekwa ala anyi a noziri n’ oge anwuchikoro ya naputa umuagboghobia abuo n’ aka ya, bu ndi gunyere: Doris Nelson gbara afo iri abuo na ato ma buru nwa afo Gombe State nakwa Ugochukwu Winner gbara afo iri abuo na otu nke bu nwa afo obodo Isinweke dina Ihite Uboma na Imo State.

Anokwara oge ahu choputa na Doris Nelson muru nwa ohuru n’ ubochi Monday nke izu uka gara aga mana nwoke a erefugo ya n’ aka onye ana amatabeghi onye obu, dika Ugochukwu Winner bu afo ime onwa asaa nke yabu nwoke n’ eche ka omuputa maka orire.

N’ oge ona echezi nwoke a n’ iru ndi nta akuko unya bu Monday na Umuahia ka onye state Commandant habu ndi nchekwa NSCDC bu Usman Al-fadarai mere ka amata na mazi Nnanna Michael ejirigo onu ya kweta n’ aka olu ya bu ikpokonata mana elekota umunwaanyi di ime nke oga abu ha mucha umu orefucha habu umuaka amuru ohuru.

Okowara na nwa nke ahu Doris Nelson muru ohuru ka orere n’ onu ego di otu nde Naira na otu uma yabu; 1 point 1 Million Naira, ebe okwere yabu nwagbobia nkwa oke ego di nari puku Naira ise nke putara; 5 Hundred Thousand Naira, kama n’ obu otu nari puku Naira bu 1 Hundred Thousand Naira ka onyegoro ya.

Yabu onye Commandant ndi nchekwa Civil Defence na Abia State mechara n’ ikpeazu gwa ndi nta akuko n’ aga enyefe nwoke a n’ aka ulo olu National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons NAPTIP ikpuga ya ulo ikpe ma emecha ya nnyocha.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies