FAROTIMI ENWETALA INA NA AKAEBE NA ULO IKPE UKWU ETITI ALA ANYI
Written by admin on December 9, 2024
Ulo ikpe Federal High Court ji Ado-Ekiti bu isi obodo Ekiti State mere onodu enyela iwu ina na akaebe gaara nwa amadi ahu bu onye okaiwu na azo maka ikike diara ndi mmadu ejichiri ejichi kemgbe bu Barr Dele Farotimi.
Barr Farotimi ka iga echeta na obuna ubochi Tuesday nke izu uka gaara aga ka aka ndi uwe oji sitere Ekiti State gara kpata ya na Lagos State kwere maka ebubo ikato aha mmadu.
Yabu onye Human Rights Lawyer ka ana ebo ebubo na ositere na akwukwo ederede obiputara ohuru kato aha Chief Aare Afe Babalola nwe ulo akwukwo mahadum Afe Babalola University.
Ka osiladi, na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze ya taata bu Monday ka nwa amadi ahu ji okoloto otu ndorondoro African Action Congress AAC zoo okwa onye isi ala Nigeria bu Omoyele Sowere mere ka amata na anarago Barr Dele Farotimi na akaebe.
Sowere kowara na obu ego di nde Naira iri ise yabu 50 Million Naira ka eji nara nwa amadi a na akaebe yanakwa otu onye okwu na azu ga akwukwu nde Naira iri ise nke ya.
Omeziri ka amata na eyighariri ikpe nwa amadi a ka oburu na abali iri abuo na iteolu nke onwa ozo bu January afo 2025 na akpudobe nso.