Ndi Uwe Oji Asuola Ndi Isiekweonwu Ka Nri Ede Na Imo State

Written by on September 16, 2024

Ndi uwe oji ala anyi na Imo State anapula ndi osochi egbu mmadu ato ndu ha n’ ike na State ahu bukwanu ndi ana ebo ebubo na ha choro iwakpo otu ogige isi ulo olu habu ndi uwe oji.

N’ ozi onyefere ndi nta akuko n’ ogige Police Command Headquarters dina Owerri taata bu Monday ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Imo State bu ASP Henry Okoye mere ka amata n’ obu ogige isi ulo olu Umuakah Divisional Police Headquarters nke Njaba LGA ka ndi oji egbe eri ahu choro iwakpo.

ASP Okoye gwara ndi nta akuko n’ obu unya bu uka ka ndi isi ekwe onwu ahu buru bata n’ ike iwakpo yabu ogige isi ulo olu ndi uwe oji.

Nwa amadi a ji okwa Police Public Relations Officer PPRO na Imo State kwuputara n’ obu ugboala Sport Utility Vehicles SUVs di ato ka ndi oluo otunye isi ahu jiri bata n’ ike ma malite izoo mgbo egbe ka mmiri na yabu ogige Divisional Police Headquarters.

Okowara na ndi uwe oji no olu oge ahu mere ngwangwa hazie onwe ha ma jiri mgbo egbe nke ha zaghachi ha oku onwu ahu nke kpataziri na mmadu ato n’ ime habu ndi oluo otunye isi noro na nkwakorita mgbo ahu gawa iza oku bee ndi mmuo.

Yabu onu n’ ekwuru ndi uwe oji ala anyi na Imo State koro ndi nta akuko na ndi isi ekwe onwu ndi ozo bucha ihe mmeru aru sitere na mgbo egbe wanye isi n’ ohia.

ASP Henry Okoye kwuputara n’ ihe ndi uwe oji naputara n’ aka ndi oji egbe eri ahu gunyere: otu egbe General Purpose Machine Gun, otu egbe AK-47 rifle, ugboala ato ndi gunyere: Toyota Lexus 470, nke Mercedes GLK nakwa Toyota Venza.

ASP Okoye kwuputara na Commissioner ndi uwe oji ala anyi na State ahu bu CP Aboki Danjuma anorola n’ isi ugbo ndi uwe oji chi nnukwute oku achisoo inwuchiko ka ha raa bu ndi oji egbe eri nke ahu ji ihe mmeru aru sitere mgbo egbe ria mbombo oso.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies