Ọchịchị ndị agha ntị ịkpọ akpọrọ Taliban nke mba Afghanistan anwụchiela otu di na nwunye bụ ụmụ afọ mba Britain.
Written by admin on February 24, 2025
Otu di na nwunye bụ ndị megoro okenye karịa afọ iri asaa bucha ụmụ afọ mba Britain abụrụla ndị otu ndị agha nọ n’ọchịchị na mba Afghanistan akpọrọ Taliban kpara aka ọjọọ.
Mmadụ abụọ ahụ e nyere aha ha dịka Peter Reynolds gbara afọ iri asaa na itoolu yana nwunye ya bụ Barbie gbara afọ iri asaa na ise ka ozi kwuru na ha na a lọta n’ụlọ ha dị na obodo Bamiyan oge anwụchiri ha.
Di na Nwunye ahụ ka e kwuru na ọrụ ha bụ inye ndị mmadụ ọzụzụ akpọrọ training project bụ nke ha megoro na mba ahụ ihe kariri afọ iri na asatọ ugbua. N’ozi sitere n’aka ada ha nwaanyị bụ Sarah Entwistle bụ onye gwara ndị nta akụkọ bbc na ya ahụbeghi ma ọ bụ nụ olu nne na nna ya ihe kariri izu ụka abụọ ugbua.
Odobeghi anya ihe kpatara ejiri nwụchie ha mana akaọrụ ha bụ inye nne na ụmụ agbọghọ ọzụzụ ka e kwuru na iwu obodo ahụ ha bi na ya kwadoro ya kama n’ọchịchị nke otu Taliban nọ n’isi ya amachiela ụmụ nwaanyị inye ụmụ agbọghọ kariri afọ iri na abụọ ọzụzụ nkụzi ọbụla na mba ahụ.
Di na Nwunye ahụ zutere onwe ha na mahadum University of Bath mechara lụọ onwe ha n’obodo Kabul n’afọ 1970.
Ha malitere rụwa ọrụ ahụ n’afọ 2009 mana kemgbe otu Taliban lọghachiri azụ n’ọchịchị n’ọnwa August nke afọ 2021 ka ahụrụ ndị na-arụ udiri ọrụ ahụ ka ha hapụrụ ọrụ ha ma rie mbọ mbọ ọsọ ebe Mr Reynolds yana nwunye ya kachiri ntị na o nweghị ebe ha n’aga.