Okaiwu Otu IPOB Akpola Oku Ntoghapu Gaara Ndi Ntorobia Igbo Ejichiri Na Ogige Ndi Agha Nigeria
Written by admin on March 10, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye okaiwu Nigeria amaama na izo maka ikike diara ndi mmadu ma burukwa onye isi ndi okaiwu otu Indigenous People of Biafra IPOB bu Barr Ifeanyi Ejiofor akpokuola govt etiti nakwa okaiwu izugbe ala anyi na okwa Attorney General of the Federal bu Prince Lateef Fagbemi ka ha mee ngwangwa nye iwu ka atoghapu nari kwuru nari ndi ntorobia ala Igbo ejichiri ejichi na uzo megidere iwu na ogige ndi agha Wawa Barracks dina Niger State nke mgbago ugwu North Central obodo a.
Barr Ejiofor kporo oku a taata bu Tuesday na ozi onyefere ndi nta akuko bukwanu ebe onoro katoo ebubo oboro sina ikpe nkwumoto obodo a bu naani maka ndi mgbago ugwu, ebe eji ikpe mara eziokwu eso ndi ndida ugwu.
Yabu okaiwu kwara ariri sina habu ndi ntorobia ala Igbo ejichiri na nke ndi agha anola otutu oge na aka ndi agha ahu ji ha na enweghi ka esiri ekpe ha ikpe.
Okowara nke a dika oke mmeto megide ikike diara ha dika osiri dina iwu.
Na oge ona akowa enweghi afo ojuju megide ajo onodu nnwuchiko aghara aghara ana anwuchiko umu afo Igbo ma rapu ndi osochi egbu bandits nakwa umunee ha ndi agha isi ekwe onwu terrorist sitere mgbago ugwu okachasi na oge Abubakar Malami ji okwa Attorney General ala anyi ka Barr Ifeanyi Ejiofor mere ka amata na obodo a bu Nigeria anwago ndidi ndi Igbo ogologo oge.
Barr Ejiofor yoziri ochichi President Bola Ahmed Tinubu ka omara ihe omere weghachite ntukwasa obi ohaneze na usoro ikpe nkwumoto ala anyi a site na itoghapu habu nari kwuru nari ndi ntorobia ala Igbo ejichiri ejichi na ogige ndi agha dina Niger State kemgbe.
#
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.