Ọnọdụ ahụike nke Pope Francis akawanyela njọ dịka anọrọ ụnyaahụ bụ Monday were gbatịa ụbọchị ọ ga-anọ n’ụlọ ọgwụ ịnara ọgwụgwọ.

Written by on February 18, 2025

Onyeisi nke ụlọ nzukọ nsọ catholic bụ Pope Francis anọrọla n’ụlọ ọgwụ ụnyaahụ bụ Monday malite ọrụ ya dịka ọ nọgoro abalị anọ zuru oke maka ịnara ọgwụgwọ.

Ka osiladi, ogige isi mmiri nke ụlọ ụka catholic church dina Vatican ekwuola sina ọnọdụ ahụike nke nwa amadi ahụ megoro afọ iri asatọ na asatọ bụ nke kwanyere njọ kpatara aga eji gbatịa ụbọchị ndị ọ ga-anọ n’ụlọ ọgwụ maka ọgwụgwọ.

Pope Francis ka e buru gaa n’ụlọ ọgwụ Gemelli Hospital dina Rome nke mba Italy n’ụbọchị Friday gara aga maka ọrịa akpọrọ bronchitis.

Na nyochaa ahụike e mere ya ụnyaahụ bụ Monday ka Vatican kwuru na achọpụtakwara na o bu ọrịa ọzọ akpọrọ polymicrobial infection nke na emetụta oghere mmadụ ji eku ume.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited