Ọnụ na e kwuru ụlọ omebe iwu Anambra Steeti house of assembly agbaruola ihu etu onye ana ebo ebubo igbu onye omebe iwu na state ahụ si rie mbọ mbọ ọsọ n’ogige ndị uwe ojii ebe a kpọchiri ya.

Written by on February 20, 2025

Ọnụ na e kwuru ụlọ omebe iwu Anambra Steeti house of assembly bụ Somtochukwu Nkem Udeze ekwuola na ọ wụrụ ya akpata oyi etu nwa amadi anwụchiri maka ogbugbu nke Hon Justice Azuka bụbu onye omebe iwu nke state ahụ siri gbapụ n’ogige ndị uwe ojii ma rie mbọ mbọ ọsọ.

Ozi na eru anyị aka mere ka amata na ndị uwe ojii na Anambra sitere n’ọnụ onye na e kwuru ha bụ sp Tochukwu Ikenga were kwupụta na mmadụ abụọ anwụchigoro maka ogbugbu nke e gburu onye omebe iwu na state ahụ agbapụla n’ogige ha.

Hon Justice Azuka nke ahọpụtara site n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party ka ndị ntọri kpara aka ọjọọ n’okporo ụzọ Ugwunankpa inland town dina Onitsha Anambra Steeti.

Emechara hụ ozu onye omebe iwu ahụ na mpaghara akwa mmiri 2nd Niger bridge ebe ọ malitegoro ire ure ka o mechara abalị iri anọ a tọrọ ya.

Ya bụ onye ji ọkwa nke speaker mechara gbaruo ihu ma kwuo na ọnọdụ emebiela ezi aha ejiri mara ndị uwe ojii n’ala anyị tinyere mbọ ha gbagoro iji belata ma kpochapụ mpụ na arụ n’obodo anyị. Ọ kpọkuru Commissioner ndị uwe ojii na Anambra Steeti bụ cp Ikioye Orutugu ka ha kee ajụ na ume iji were nwụchigharia mmadụ abụọ ahụ nọ na ọsọ ka ọ dị ugbu a ebe ọbụla ọ sọkwara ha zoo onwe ha n’okpuru anyanwụ.

Somtochukwu Nkem Udeze gwara ndị uwe ojii ka ha mee ngwangwa na eleghị anya na azụ kwupụta ma gbasaa aha ndị ahụ, eserese ha yana ebe ha si dịka ndị ana achọ achọ iji nyere ọhaneze aka ịmata ndị ana ekwu maka ha.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies