Otu Ndorondoro APGA Ajula Osisa Ntule Aka Okpuruochichi Ime Obodo Enugu State

Written by on September 25, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu ndorondoro All Progressives Grand Alliance APGA ajula osisa ntule aka ochichi Local Govt Elections were onodu na Enugu State n’ ubochi Saturday gara aga.

Obu onye isi oche otu ndorondoro a na Enugu State bu mazi Ekene Uzodimma mere ka nke a puta ihe n’ isi obodo Enugu n’ ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Tuesday ka ha mechara nzuko ndi onu n’ eru n’ okwu n’ otu ndorondoro APGA na State a.

Mazi Uzodimma boro ebubo nruru aka nke ojo ya megide yabu ntule aka okpuru ochichi ime obodo na State a.

Nwa amadi a turu aka ojo sina ulo olu Enugu State Independent Electoral Commission ENSIEC kwachara anya menyere otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP nona isi ugbo ochichi State a na ntule aka ochichi ahu.

Yabu onye isi oche otu ndorondoro APGA na Enugu State kowara n’ ufodu ihe mgbama nruru aka na ntule aka ochichi ahu gunyere: ndi mmadu aputaghi nke oma isonyere na ya, ibia n’ azu oge ma obukwanu abiaghi chaacha n’ ufodu ebe bu akuru ngwa ekwesiri iji mee ntule aka ochichi ahu, nakwazi enweghi akwukwo ndeko osisa yabu ntule aka akporo Result Sheets n’ ogige Polling Boots niile enwere na State a.

Hon Ekene Uzodimma kwuputara n’ otu ndorondoro APGA ga agbaga ulo ikpe inaputa ihe okowara dika nturu ugo otu ndorondoro a nwetara n’ otutu mpaghara State a na yabu ntule aka ochichi.

Ebe nakwa okwa ndi ahu onye isi oche otu ndorondoro APGA boro ebubo sina otu ndorondoro a turu ugo na Enugu State gunyere: okwa onye isi oche Awgu LGA, nke Udi, Aninri nakwa Enugu South LGAs.

Ndi ozo eweburu: ndi Councillors nke Asata Ward 1, nke Ogbaku Ward, Awgu Ward 2, Obeagu Ward, Awgu Ward 9, Trans-Ekulu Ward, nakwa Abakpa Ward 1.

Iga echeta n’ ulo olu ENSIEC noro na ubochi uka gara aga kwuputa n’ obu naani ndi ahu ji okoloto otu ndorondoro PDP zoo okwa turu ugo dika ndi isi oche okpuru ochichi ime obodo iri na asaa enwere na State a.

Yabu ulo olu ENSIEC gara n’ iru noro na ubochi Monday kpoputa osisa ntule aka ochichi a maka ndi nke Councilors, ebe omere ka amata n’ obukwu naani ndi jicha okoloto otu ndorondoro PDP zoo okwa turu ugo n’ onumara Wards di nari abuo na iri isii enwere na State a.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies