Otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP na Abịa State amalitela ịrịọ Gov Alex Otti na-achị state ahụ ka ọ laghachi azụ n’otu ahụ ọ nọ bụ na ya.

Written by on February 18, 2025

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP na Abịa State amalitela ịrịọ Gov Alex Otti na-achị state ahụ ka ọ laghachi azụ n’otu ahụ ọ nọ bụ na ya.

Nkea sitere n’ọnụ onyeisi oche otu board of trustees nke party ahụ bụ Adolphus Wabara.

Sen Wabara kwuru na Gov Otti na azọ ụkwụ dị mkpa na ọrụ ndị ọ na-arụ na state bụ nke o kwuru na ọ naghị ele anya n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye sị na ya. O kwuru na ọ ga-amasị ha ka onye gọvanọ ahụ lọghachi azụ n’otu PDP.

O mere ka nkea pụta ihe n’oge ọgbakọ ha were ọnọdụ n’ogige International conference centre icc dina Ụmụahia bụ isi obodo Abia State.

Sen Adolphus Wabara gbakwunyere na Gov Alex Otti yana ogbo na-achị Enugu state bụ Gov Peter Mbah abụrụla ọ pụrụ iche na mpaghara South East niile ma ekwuwa ihe banyere ezi ọchịchị bụ ịgba.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies