AKATOLA AKA NA ACHI EBONYI STATE MAKA IME NNA YA EZE ODINALA
Written by admin on December 9, 2024
Ufodu ndi mmadu sitere na owa ozi mmekorita ohaneze agala na iru buru nkato bugara aka na achi Ebonyi State bu Gov Francis Ogbonna Nwifuru maka nkeputa okeputara obodo kwuru na onwe ya nke ohuru ma were nna muru ya mee eze odinala yabu obodo ohuru.
Ozi kowara na Gov Francis Nwifuru noro na odi nso a kewaputa imime obodo ya ma baa ya aha dika Oferekpe Agbaja Autonomous Community na Izzi LGA ebe onoro nwanne unya bu Saturday chie nna ya bu Chief Ezekiel Nwifuru Nwankpu echichi eze odinala yabu obodo.
Chief Ezekiel Nwifuru Nwankpu ka ozi kowara na obu onye ama ama na olu ugbo ma buru nwoke luru nwunye iri na iteolu kama na obu iri na asaa ka hana ya ka bi ugbu a, ebe ndi nwunye ya ahu mutara ya umuaka di otu nari na asato yabu; 1 Hundred and 8 children nke otu na ime ha bu yabu Gov Francis Ogbonna Nwifuru.
Na ozi onyefere ndi nta akuko na owa ozi mmekorita ohaneze taata bu Monday ka nwa amadi ahu jitopuru okwa ode akwukwo mgbasa ozi nyere otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP na Ebonyi State bu Hon Nwoba Chika Nwoba kowara nke a dika yabu aka na achi State irapu mkpa chere State ahu na iru chowa naani odimma nke onwe ya.
Ufodu ndi ozo nke gunyere: Igwe Jonah, Humble Peter, Ichie Onodugo nakwazi otutu ndi ozo kowara omume a dika nke na egosi na yabu aka na achi Ebonyi State aghotabeghidi ihe ndi ahu ekworo maka ha roputa ya na okwa Governor State ahu.