ULO NZUKO OMEBE IWU EBONYI STATE ACHOPUTAGO NDI OLU NGO OKPORO UZO NA APIAWA OCHICHI STATE AHU AZU

Written by on December 12, 2024

Ulo nzuko omebe iwu Ebonyi State House of Assembly akatola ya na ebe odi ukwuu bu ebubo ajo akparama agwa nke ufodu ndi olu ngo enyere olu okporo uzo di kilometers abuo na otu na otu gaara Ohaozara, Onicha nakwa Afikpo LGAs dicha na ogbonta vote Ebonyi South Senatorial District.

Nke a putara ihe unya bu Wednesday oge otu committee yabu ulo nzuko na ahu maka olu mwulite nakwa nke na ahu maka nleta olu ngo megara njem nleta na okporo uzo ndi a.

Otu committee abuo a kwuputara enweghi afo ojuju ya sina onweghi nke aruru ezi olu na okporo uzo ndi a ha megara njem nleta okachasi na nke Ohaozara nakwa Onicha LGAs, ebe ahutara na habu ndi olu ngo enwebeghidi ka ha sigoro malite olu chacha na ufodu habu okporo uzo.

Ndi omebe iwu a tara aka na ezi sina habu ndi olu ngo na eme nke a na agbanyeghi na govt State ahu akwugo ha ugwo mmalite olu di per cent iri ato kemgbe onwa May afo a bu 2024 enyefere ha olu ngo a.

Na okwu ya ka Hon Nkemka Okoro Onumah bu onye isi oche otu committee olu mwulite ma burukwa Chief Whip ulo nzuko ahu kowara ya dika ihe mgbawa obi sina ndi olu ngo a na akpa yabu agwa ojo na agbanyeghi na otutu na ime ha bu umu afo State ahu ma burukwa ndi eji okwu ha agba izu na obodo.

Na otu aka ahu ka Hon Okechukwu Ukie Ezeali na anochite ogbonta vote Afikpo North East State Constituency ma buru onye isi oche nke otu committee nleta olu ngo kwuputara obi mgbawa ya nyere adighi ike na olu habu ndi olu ngo.

Ndi omebe iwu ozo sona otu Committee abuo a megara yabu njem nleta gunyere: Hon Godwin Abiri, Hon Barr Aloysius Nwodo, Hon Friday Ogbuewu, Hon Ifeanyi Nwakpu, Hon Igu Chikezie Nwankwo, Steve Orji Igwe, Victor Nwoke, Obinna Mbam, Joseph Ununu nakwa Hon Henry Sunday Eze.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies