Ulo Olu ISIEC Ahazichala Ihe Niile Maka Ntule Aka Okpuruochichi Ime Obodo Na Imo State

Written by on September 20, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo olu Imo State Independent Electoral Commission ISIEC achikochala nhazi niile maka nchikoba ntule aka ochichi ga ewere onodu na okpuruochichi nakwa onumara Wards niile enwere na State ahu echi bu Saturday, abali iri abuo na otu nke onwa September anyi nona ime ya.

Nke a putara ihe oge ngalaba akuko uwa anyi kpoturu onye isi oche yabu ulo olu ISIEC na Owerri bu isi obodo State ahu bu Chief Charles Ejiogu imata ka eke siri anya anwu nyere nkwadobe yabu ntule aka ochichi.

Chief Ejiogu gwara ngalaba akuko uwa anyi n’ enyela ozuzu nakwa nke nzughari gaara ndi olu ulo olu ahu gunyere ndi nke nchere oge bu ad-hoc staff ga esonyere na ntule aka ochichi a.

Okwere nkwa si na ntule aka ochichi a ga aga siriri werere na onumara Wards di nari ato na ise enwere na yabu Imo State.

Chief Charles Ejiogu gara na iru kwuo si na ulo olu ya ga agbasoro nkwuba aka oto na yabu Imo State Local Govt Elections.

Onye nta akuko anyi bu Chukwuma Philips wetara ozi n’ obuna afo 2018 na oge ochichi Rochas Okorocha bu oge ikpeazu achikobara ntule aka ochichi Local Govt Elections na Imo State.

 

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies