Gov Soludo Akpolitela Ma Duo Commissioner Mgbasa Ozi Ohuru State Ahu Na Iyi Olu

Written by on September 18, 2024

Aka n’ achi Anambra State bu Gov Charles Chukwuma Soludo eduola Dr Law Mefo n’ iyi olu dika Commissioner ohuru n’ ahu maka mgbasa ozi na State ahu.

Nke a putara ihe n’ obi govt dina mpaghara Amawbia nke Awka bu isi obodo Anambra State dika ulo nzuko omebe iwu State ahu nochara unya bu Tuesday nyocha ma kwado mkpolite n’ okwa nwa amadi a.

Gov Charles Soludo kpolitere Dr Mefo ma zigara ya ulo nzuko omebe iwu Anambra State House of Assembly kwere maka ugbonwamkpi onoro yabu unya gbara Hon Paul Nwosu n’ okwa Commissioner mgbasa ozi State ahu.

Ka osiladi, n’ ogbako plenary ejiri nnyocha nwa amadi a ka ahutara n’ obu osote onu n’ ekwuru ulo nzuko ahu n’ okwa Deputy Speaker bu Rt Hon Chukwuma Okoye noro n’ isi ya.

Ka ha mechara ya nnyocha ka ndi omebe iwu ahu jiri otu olu na otu obi nye ya nkwado dika Commissioner aroputara ohuru.

Nke a kpatara Gov Soludo mechara noro n’ uhuruchi unya na Amawbia duo ya n’ iyi olu imalite olu ozugbo dika Commissioner mgbasa ozi State ahu.

Gov Soludo nyere ya ndumodu ka oweputa ubara amamihe ya gbara ohaneze ndi Anambra State odibo dika Commissioner mgbasa ozi State ahu.

Na nke ya ka yabu Dr Law Mefo kenere aka n’ achi Anambra State maka ihuta ya ama n’ okwa a, ebe okwere nkwa ezi olu.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies