Nigeria Amala Afo Na Ala Ozo Na Usoro Nkwuba Aka Oto Na Ego Ohaneze

Written by on August 13, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ala anyi bu Nigeria akuola afo na ala ozo nke afo abuo ya dika osiri metuta opekata mpe achoro na nkwuba aka oto na usoro ego ohaneze obodo a na udi akporo Minimum Fiscal Transparency.

Nke a putara ihe site na ozi ngalaba US Department of State nke mba United States of America weputara banyere onodu ego ohaneze.

Yabu ngalaba mba America kowara na onweghi ihe ahuru anya ala anyi mere maka nkwalite onodu nkwuba aka oto ya na usoro nchikwa ego ohaneze nakwa mmepe ohere maka ego na afo 2025 ruo taata.

Na ozi a akporo 2026 Fiscal Transparency Report ka America noro nyocha ochichi mba di otu nari, iri ato na iteolu, gunyere nke mba Palestine, ebe ahutara na obu mba iri asaa na ato nwetara opekata mpe ihe ndi achoro maka nkwuba aka oto na usoro ego.

Mba iri isii na asaa mara afo na ala ka ahutara iri na ano na ime ha ka ha seliteturu isi ma elegara anya na ajo onodu ha na afo gara aga, ebe mba iri ise na ato nke gunyere ala anyi bu Nigeria enweghidi ihe nselita isi obuna ha mere na ajo onodu akwubaghi aka oto na usoro ego ohaneze.

Ndi nta akuko nwetara ozi na nke a na abia dika umu afo Nigeria na ekwugide ajo onodu etinyeghi na olu nke oma bu ego mkpata na mmefu ala anyi, okachasi dika ochichi President Bola Ahmed Tinubu di ugbu a ji aka ato wunye na onu na otu oge dika osiri di na ego nzube olu afo ato ndi gunyere: 2024, 2025 nakwa 2026 na agako ka odi ugbu a na otu oge.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited