Ndi Uwe Ojii Anwuchiela Ndi Ana Enyoenyo Na Ha Napuru Mmadu Ndu Ya Na Ike Na Anambra State

Written by on November 16, 2026

by Maduabuchi Onwe

Ndi uwe ojii ala anyi na Anambra state anwuchiela mmadu ise kwere maka agwa ekperima itoro otu nwoke enyere afa ya dika Chimedu Echezona ma gbuo ya ka ha natachara ndi ezinaulo nwoke ahu ego di nde naria ise na state ahu.

Habu ndi omekome ka ozi mere ka amata na anwuchiri na abali iri na abuo nke onwa November afo a bu 2026 na mpaghara Omoba phase two nke dina Nkpor na Onitsha nke Anambra state.

Nke a putara ihe site n’onu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na state ahu bu SP Tochukwu Ikenga n’ozi onyefere ndi nta akuko unya bu uka, dika omere ka amata na ha nwuchiri habu mmadu ise ma naputa ha ego di nde naria ise.

Kosiladi, ha mechara wee nye afa habu ndi omekome dika; Chidozie Francis gbara afo iri abuo na ano, Kosisochukwu Ezeani gbara afo iri abuo na asaato, Akachukwu Mmaduabuchi gbara afo iri abuo na abuo, Chibuzor Onuorah gbara afo iri abuo na iteolu nakwa Echezona Udeh gbara afo iri abou na abuo na state ahu.

N’ikpeazu ka ozi meziri ka amata na habu ndi omekome toro nwamadi ahu na abali iri abuo na iteolu nke onwa January afo a bu 2026, ma napu ya ndu ya n’ike na state ahu.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited