Mmanwu Ekpo: Aka Ndi Uwe Ojii Akpatala Mmanwu Abuo Na Akwa Ibom State
Written by admin on November 15, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka ndi uwe ojii ala anyi na Akwa Ibom State akpatala mmadu abuo ana enyoenyo na ha ji ihe banyere mmanwu amara dika Ekpo Masquerade gaa nochie okporo uzo mana akapu ndi okpu ugboala nakwa ndi ji ukwu aga ego na ike na State ahu.
Na ozi onyefere ndi nta akuko na Uyo bu isi obodo yabu Akwa Ibom State ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State ahu bu DSP Timfon John mere ka amata na obu unya bu Saturday ka aka kpatara ndi a ana enyoenyo.
DSP John koro ndi nta akuko na obu na ogologo okporo uzo Etim Ekpo-Azumini road ka ndi mmanwu a gara nochie ma bute uzo agaghi aga megide ndi ji ugboala nakwa ndi ji ukwu aga.
Ogara na iru kowa na habu mmadu abuo bu mmanwu aka kpatara jicha mma obejiri nakwa ngwa ogu ndi ozo na eyija ndi njem na okporo uzo ahu.

