CP Ogarabe Amalitela Olu Ya Nke Oma Na Enugu State, Kpoturu AIG Dantawaye

Written by on November 19, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Commissioner ohuru ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State bu CP Fidelis Ndubuisi Ogarabe emegala njem mkpoturu gaara onye Assistant Inspector General habu ndi uwe ojii na elekota Zone 13 dina Ukpo nke Dunukofia LGA na Anambra State bu AIG Miller Dantawaye.

Nke a putara ihe unya bu Wednesday na njem a CP Ogarabe kowara dika iga mee ka yabu onye onona okpuru ya mata nke oma na obu ya buzi onye isi ndi uwe ojii na Enugu State.

CP Ogarabe noro na njem a kwunwuo mkpebi ya nyere ezi onodu nchekwa ndu na akuluba ọhaneze ndi Enugu.

Na nke ya ka AIG Dantawaye kenere nwa amadi a maka okwa ohuru a onwetara nyere ndi uwe ojii ala anyi na State a, ma goro ya ofo oma dika ogbara ya ume maka ezi olu.

Onye nta akuko anyi bu Nnabuife Nwekwu wetara ozi na njem a sochiri mmalite olu CP Ogarabe dika onochara nwanne unya bu Tuesday weghara okwa Commissioner ndi uwe ojii na ozuzu oke ya site na aka Commissioner nke puru apu bu CP Mamman Bitrus Giwa.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Continue reading

Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited