Ndị uwe ojii na mba France anwụchiela mmadụ iri ana ebo ebubo na ọ bụ ha nyere Mohammed Amra aka bụ onye atụrụ mkpọrọ ka anwụchichara ya na mba Romania

Written by on February 24, 2025

Ndị uwe ojii na mba France anwụchiela mmadụ iri ana ebo ebubo na ọ bụ ha nyere Mohammed Amra aka bụ onye atụrụ mkpọrọ ka anwụchichara ya na mba Romania. Mmadụ iri ahụ anwụchiri ugbua ka e kwuru na ha nyere nwoke ahụ aka ka ọ rie mbọ mbọ ọsọ.

Ndị uwe ojii ahụ kwupụtara nkea ụnyaahụ bụ ụka n’obodo Paris bụ isi ọchịchị mba France. Ha kwuru na ana atụ anya na ọ bụ ndị a kpara ma hazie etu nwoke ahụ siri gbanahụ ndị uwe ojii tinyere ebe ha mechara zoo ya.

Ya bụ njinji jiri n’ọnwa May nke afọ gara aga bụ oge ndị oji egbe zoro n’akụkụ okporo ụzọ chebiri ụgbọala ndị mkpọrọ bu Amra na aga n’ogige ndị mkpọrọ dị na mgbago ugwu mba France.

N’oge ahụ ka anọrọ gbuo ndị ọrụ nche nke ụlọ mkpọrọ mmadụ abụọ ebe mmadụ atọ ndị ọzọ ka e merụrụ ahụ site na ogbunigwe akpọrọ grenade nke ndị ahụ jiri mee ya bụ nkusu.

Mana ugbua, aka akparachala ndị ahụ niile ana atụ anya na ọ bụ ha kpara ya bụ arụ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies