Otu nwoke gbara afọ iri abụọ na atọ ejirila aka ya were tigbuo enyi ya nwaanyị na Lagos state.

Written by on February 25, 2025

Ndị uwe ojii Lagos State Police Command ekwupụtala nwụchi nke ha nwụchiri otu nwoke gbara afọ iri abụọ na atọ e nyere aha ya dịka Gbolahan Adebayo maka ogbugbu nke o jiri aka ya were tigbuo enyi nwaanyị gbara afọ iri abụọ na ise.

N’ime ka ndị nta akụkọ mata nkea ụnyaahụ bụ Monday ka ọnụ na e kwuru ndị uwe ojii na Lagos state bụ Benjamin Hundeyin kwuru na nwoke ahụ kpara ya bụ arụ n’oge ọ kụrụ elekere asatọ nke abalị ụbọchị Friday bụ abalị iri abụọ n’otu nke ọnwa Febrụwarị na mpaghara Ijedodo nke Isheri-Osun.

Otu onye agbata obi nwoke ahụ kwuru na ha nụrụ olu nwata nwaanyị ahụ ka enyi ya nwoke na-eti ya ka akpa aja. Mana mgbe ha garuru ịmata ihe na-ese ka ha hụrụ nwata nwaanyị ahụ ka ọ tọgbọrọ n’ala.

Emere ngwa ngwa buru ya gaa n’ụlọ ọgwụ dina Ijegun bụ ebe anọrọ kwuo na ọ bugoro onye nwụrụ anwụ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited