Gọọmenti Rivers State ewepụtala abalị itoolu nke ọnwa August n’afọ a dịka ụbọchị ohuru aga eji meghari ntuliaka council ime obodo na state ahu
Written by Onyinye on March 6, 2025
Ụlọrụ n’ahụ maka ntụliaka ọchịchị na Rivers State bụ Rivers State Independent Electoral Commission ewepụtala abalị itoolu nke ọnwa August n’afọ a dịka ụbọchị ọhụrụ aga eji meghari ntụliaka council ime obodo na state ahụ.
Onyeisi oche nke ya bụ ụlọrụ bụ Justice Adolphus Enebeli jegoro ezumike nka kwupụtara nkea mgbe yana ndị ọnụ na eru n’okwu na state ahụ na enwe ọgbakọ ha n’ogige isi ụlọrụ ahụ dina Aba Road Portharcourt Rivers State.
Nwa amadi ahụ gwara otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche enwegasiri na state ahụ ka ha jikere maka ya bụ ntụliaka ọhụrụ ma gbasoro usoro iwu na-achịkwa ntụliaka ọchịchị na state Rivers.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.