Latest Updates
by Moses Nnabuife Nwekwu Govt etiti ala anyi anaputala umu afo obodo a mmadu ise ejichiri kemgbe onwa August afo 2025 na ulo nga dina Abidjan bu isi obodo mba Cote D’Ivoire, ebe onye kara ime ha onye nke isii nwuru ngwangwa agbaputachara ha na ebe ahu ejichiri ha. Na ozi onyefere ngalaba akuko […]
by Moses Nnabuife Nwekwu Otu jikoro ndi nkuzi mahadum akporo Academic Staff Union of Universities ASUU ngalaba ya nke Owerri Zone enyedebela aka na achi Imo State bu Gov Hope Uzodimma nakwa ogbo ya nke Anambra State bu Gov Charles Chukwuma Soludo abali iri na ano nke putara izu uka abuo ka ha tinye […]
by Moses Nnabuife Nwekwu Aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah enyela nkwado ohere agum akwukwo na efu gaara ndi kariri nari mmadu asaa na iri isii na usoro 2025/2026 Local Scholarship Scheme iji kwalite atumatu ochichi ya ji na aka nyere ezi onodu mmuta State a. Na okwu ya unya […]
by Moses Nnabuife Nwekwu Agba nke ato ha na ime umu afo Nigeria ahu ana akusu na mba South Africa anorola taata bu Tuesday wuchie ala anyi a, kpomkwem na odu ugboelu Murtala Muhammed International Airport dina Lagos State. Nke a bu dika ugboelu Air Peace bu ha wuchiri odu ugboelu ahu dina Ikeja […]
by Maduabuchi Onwe Otu ndorondoro ochichi People’s Democratic Party PDP akatola nwamadi ahu na achi Ebonyi State bu governor Francis Ogbonna Nwifuru maka ihe ha kowara dika okwu ojoo okwuru gara minister na ahu maka Abuja bu Nyesom Wike na odi nso a. Ha gakwara na iru katoo adighi ike nakwa enweghi afo ojuju […]
by Maduabuchi Onwe Ndi uwe ojii ala anyi na lmo state anaputala otu nwoke enyere aha ya dika Chinonaobi Uchegbulam sitere Ubaha Orodo nke lmo state ndi ntori mmadu toro na odi nso a. Habu ndi uwe ojii gakwara na iru mee ka amata na ha naputara nwamadi ahu na aka habu ndi ntori […]
by Chidimma Kama Ndị agha ala anyị nke Sector 2, Operation Fansan Yamma, azọpụtala mmadụ ịsịị ndị ntọrị tọrọ n’oge ha nọ ọrụ na Sabon Birni LGA na Sokoto State. Nkea pụtara ihe site n’ozi ha wepụtara n’ọwa ozi mmekọrịta ọhaneze ha ụnya bụ Saturday, dịka ozi ahụ kọwara na nzọpụta ahụ were ọnọdụ […]
Chidimma Kama Gọọmenti Abia State enyela ndị bị na State ahụ ndụmọdụ ka ha ghara ịna ejị ahịhịa ekpochị ọwara mmịrị. Nkea pụtara ihe site n’aka Commissioner n’ahụ maka gburugburu bụ Mazi Philomen Ogbonna, ụnya bụ Saturday na Umuahia bụ ịsị obodo State ahụ dịka ha ghazịchara njem ngaghari mkpocha na nzacha. O gara n’iru […]
by Moses Nnabuife Nwekwu Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu ebinyela aka na iwu ohuru na achikwa usoro ulo olu njirimara akporo National Identity Management Commission NIMC Act, 2026 ma buru nke kachapuru ma nochie iwu yabu ulo olu nke emeputara na afo 2007. Na ozi onyefere ndi nta akuko unya […]
by Moses Nnabuife Nwekwu Mmiri ezochala ma gbacha unya bu Saturday na etiti ufodu mba uwa dika osiri metuta asompi iko mba uwa nke 2026 FIFA World Cup na aga na iru. Nke a bu dika mba Brazil zutere mba Haiti ma jiri okpu goal ato ana enweghi nke asatara gosi ya ihe oku ji […]