ICPC Agbala Akwukwo Ebubo Isii Na Ulo Ikpe Megide Uche Nnaji
Written by admin on July 9, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo olu Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission ICPC agbala akwukwo na ozuzu oke ya na ebubo di isii oji akpuga onye ahu jitopuru okwa Minister ala anyi huru maka ihe omimi science, nka na uzu nakwa aka nka ogbaru ohuru bu Chief Uche Nnaji na ulo ikpe.
Nke a putara ihe na ozuzu oke ya unya bu Wednesday na akwukwo ebubo agwa ekperima isii akporo six-count criminal charges ICPC gbara na ulo ikpe Federal High Court dina Abuja ma buru ebubo ndi gbadochara ukwu na asambodo awarawa nakwa agwa ekperima ndi yiri ya.
ICPC gara na iru boo Uche Nnaji ebubo iji agwa ekperima nata ego ugwo onwa nakwa orubere ndi ozo di nde Naira iri abuo na iteolu na uma iri ise na asato oge ahu onona okwa olu, ma buru nke megidere iwu Money Laundering (Prevention and Prohibition) Act emeputara na afo 2022.
Ulo olu a na ebu agha emegide mpu na aru na ala anyi boro ebubo sina Nnaji dara iwu site na iji ozi awarawa nata ochichi etiti ala anyi ikikere okwa Minister na afo 2023 dika osiri metuta asambodo okowara na onwetara na mahadum University of Nigeria, Nsukka nakwa nke usoro National Youth Service Corps.
Iga echetazi na obu na ubochi Wednesday izu uka gara aga ka ICPC sitere na enyemaka ndi nchekwa oje na mmuo ala anyi bu Department of State Services DSS nwuchiko yabu Uche Nnaji ji okoloto otu alaka otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP azo okwa Governor Enugu State na ntule aka ochichi afo 2027 ngwangwa ositere Enugu wuchie odu ugboelu Nnamdi Azikiwe International Airport dina Abuja.
