Odinkalu Ebola Tinubu Ebubo Atumatu Ochichi Nke Ugboro Ato Dika Onye Isi Ala Nigeria

Written by on July 9, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

BOLA-TINUBU

Onye okaiwu ama ama na azo maka ikike diara ndi mmadu bu Prof Chidi Odinkalu ebola ebubo sina President Bola Ahmed Tinubu na ahazi onwe ya inoro na okwa ochichi gafere ochichi nke ugboro abuo iwu ala anyi nyere ohere ya dika onye isi ala.

Prof Odinkalu kwuputara na ochichi onye isi ala na ato ntoala okowara dika atumatu ya maka ochichi nke ugboro ato ma oburu na ogacha nke ugboro abuo.

Nwa amadi a boro ebubo ndi a na ihe omume onye nta akuko ama ama chikobara nwanne unya bu Tuesday akporo Naija Unfiltered ma buru ebe onoro tuo aka sina onodu na agagasi na odi nso a nyere okwe ndorondoro nakwa imeputa iwu na egosi atumatu President Tinubu igbati ochichi ya gafere oge iwu ala anyi nyere ikikere.

Prof Odinkalu nke jiburu okwa onye isi oche ulo olu National Human Rights Commission boro ebubo sina ebum na uche atumatu ndi ahu bu ka onye isi ala anyi noro na ochichi gafere afo 2031 nke iwu ala anyi nyere nkwado ochichi nke ugboro abuo ya ibia na njedebe ma oburu na oturu ugo na ntule aka ochichi afo 2027.

Iga echetazi na iwu ala anyi nke afo 1999 nyedebere ikikere ochichi nke ugboro abuo, putara afo asato gaara onye isi ala na osote ya nakwa ndi aka na achi State na osote ha, ma oburu na ha nafere ochichi nke otu ugboro bu afo ano.

 


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited