Otu Ndorondoro Ndi Ahu Na Ama Govt Enugu State Aka Na Iru Akpupula Ochichi State A Ulo Ikpe

Written by on June 21, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu ndorondoro ndi ahu na ama ochichi Enugu State aka na iru nke gunyere: People’s Democratic Party PDP, Labour Party, Nigeria Democratic Congress NDC, nakwa Social Democratic Party SDP akpugala govt State a ulo ikpe Federal High Court, ngalaba ya nke isi obodo Enugu kwere maka imanye ego di otu nari nde Naira na iri ise N150 Million dika ugwo otu ndorondoro nakwa ndi na azoro ha okwa ochichi ga akwu dika ego inweta ikikere imado eserese achum nta nkwado ha na mpaghara obuna dina State a.

Na akwukwo ikpe a putara ihe unya bu Saturday ma buru nke edere kemgbe abali iri na ise na ime onwa a bu June ka habu otu ndorondoro deputara ndi gunyere: ulo olu Enugu State Structures for Signage and Advertisement Agency ENSSAA, onye General Manager ya bu mazi Francis Aninwike, ulo nzuko omebe iwu Enugu State House of Assembly, ulo olu Independent National Electoral Commission INEC, ulo olu Advertising Regulatory Council of Nigeria nakwa ndi uwe ojii Nigeria Police Force dika ndi nzara onu ha.

Habu otu ndorondoro nakwa ndi isi oche ha na ayo ulo ikpe ahu ka okpebie ma ulo olu ENSSAA nakwa ochichi State a ha enwere ikikere iwu imanye na ike ka otu ndorondoro kwuo yabu ego advertising permit fee di otu nari nde Naira na iri ise iji nwe ike mado eserese achum nta nkwado ha na State a maka ntule aka ochichi afo 2027.

Otu ndorondoro ndi a na ama ochichi Enugu State aka na iru kowara na ihe banyere nchikwa achum nta nkwado ntule aka ochichi di naani na aka ulo olu INEC, iwu ntule aka ochichi bu Electoral Act nakwa iwu ala anyi akporo Constitution of the Federal Republic of Nigeria.

Na oge habu otu ndorondoro na akowa na ikikere ichikwa okwa azum ahia amara dika advertising regulation bu naani ulo olu Advertising Regulatory Council of Nigeria nakwa ulo nzuko omebe iwu ogogo etiti bu National Assembly ka odi na aka ka ha yoro ulo ikpe ahu ka onye iwu ikachapu ihe a ochichi Enugu State weputara ma nyekwa ndi uwe ojii ikikere ichekwa otu ndorondoro di ichiche megide myija sitere na yabu ntuzi aka ochichi State a.

Onye nta akuko anyi wetara ozi na obu Barr Ike Ozor gbara akwukwo ikpe a dika okaiwu na ekpechitere habu otu ndorondoro na ama ochichi State a aka na iru.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited