Asompi Iko Mba Uwa Na Aga Na Iru Anorola Na Ubochi Saturday Nakwa Sunday Dajuo Na Etiti Ufodu Mba Na Esonyere Na Ya

Written by on June 21, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Mmiri ezochala ma gbacha unya bu Saturday na etiti ufodu mba uwa dika osiri metuta asompi iko mba uwa nke 2026 FIFA World Cup na aga na iru.

Nke a bu dika mba Brazil zutere mba Haiti ma jiri okpu goal ato ana enweghi nke asatara gosi ya ihe oku ji nti oke eme, ebe mba Paraguay ji otu okpu goal ana enweghi nke asatara bie mba Turkey aka ojo na aru.

Mba Netherlands nokwara yabu unya jiri okpu goal ise asatara otu gosi mba Sweden na nwoke na ibe ya raa bu na onu, ebe mba Germany ji okpu goal abuo asatara otu kwara mba Ivory Coast nkwa onwu.

Ka osiladi, mba Japan noro na ututu taata bu uka jiri okpu goal ano ana enweghi nke asatara dula mba Tunisia, ebe mba Ecuador nakwa Curacao kana agba onwe ha onye naba onye naba na asompi nke kana aga na iru na ututu a.

Na ebe uhuruchi ruo na abali taata ka mba Spain ga ezute mba Saudi Arabia, ebe Belgium ga ezute mba Iran, dika mba Uruguay ga achupu ya nyere mba Cabo Verde.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited