Nchekwa: CP Ogarabe Adoola Ndi Uwe Ojii Aka Na Nti Megide Agwa Ojo Na Enugu State
Written by admin on November 24, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Commissioner ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State bu CP Fidelis Ndubuisi Ogarabe adola aka na nti gaara ndi uwe ojii na State a megide agwa ojo nakwa agbasoghi ezi ukporo na olu ha, dika onyere iwu gaara ndi welitere isi na olu nlekota habu ndi uwe ojii ka ha kwalite ume olu inyobara anya etu ndi nchekwa a nona okpuru ha siri aru olu na mpaghara niile dina State a.
CP Ogarabe mere ka ntuzi aka ndi a puta ihe unya bu Monday na ogbako izizi ya nyere ndi nchikwa habu ndi uwe ojii ma buru ogbako were onodu na ogige Police Command’s Headquarters dina mpaghara GRA nke isi obodo Enugu.
Na ozi onyefere ndi nta akuko na ngwucha ogbako a ka onye mmekorita ohaneze nyere habu ndi uwe ojii na State a bu SP Daniel Ndukwe mere ka amata na CP Ogarabe kwunworo mkpebi ya nyere ezi nchekwa ndu na akuluba ohaneze ndi Enugu State, dika oyoro ndi bina State a maka ndonyere ukwu site na idi na ewetara ha ozi bara uru na oge ya nakwa mgbama niile nke isu imi megide agwa ekperima.
Yabu onye isi ndi uwe ojii na State a gwara ndi nchekwa a mkpa odi idi na enwe nkwanyere ugwu gaara ikike diara umu afo ala anyi ma zeere agwa nruru aka nakwa omume obuna ga ewepu ntukwasa obi ohaneze na olu ha.

