Otutu Ogige Nsichaputa Osikapa Na Nigeria Adakpola Na Olu Ha
Written by admin on November 23, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ogige ebe ndi ahu ana esichaputa osikapa na ala anyi amara dika Rice Mills di iri iteolu n’ime ogige rice mill di nari abuo na iri isii enwere na Nigeria akwusigo oru ka odi ugba a kwere maka onodu amaghi kwuru ana ahuta na ngalaba akomo oru ugbo nke obodo anyi a.
Habu ogige rice mill iri iteolu ahu enwere na ala anyi bu Nigeria mechiri kwere maka uko osikapa ndi ahu ana akoputa na ala anyi amara dika Paddy, nke meziri ka onu ego ana ere osikapa na afia wee ria elu orji ka odi ugba a na Nigeria.
Nke a putara ihe site n’onu onye isi oche izugbe nyere otu Rice Millers Association of Nigeria bu Peter Dama dika omere ka amata na yabu ajoo onodu malitere ngwa ngwa government Nigeria kwusichara atumatu ulo aku Central Bank jibu wee na agbazinye ndi oru ugbo ego na ala anyi bu Nigeria .
N’ikpeazu ka ministry na ahu maka akomo oru ugbo na Nigeria mere ka amata na obodo anyi bu Nigeria na akoputa osikapa di percent iri isii na iteolu, nke na egosizi na opere mpe Karie percent iri asaa na ise ana akoputabu na ala anyi bu Nigeria na afo 2023.
