Ochichi Etiti, Ndi Welitere Isi Na Nigeria Enyela Nkwuwa Okwu Gaara Onwu Pete Edochie

Written by on November 25, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ochichi etiti ala anyi nakwa ufodu ndi ozo eji okwu ha agba izu na Nigeria ekwuputala iru uju ha gaara onwu nwa afo Igbo ahu ama ama na imeputa ihe nkiri onyonyo na ngalaba ejije Nollywood bu Pete Edochie bukwanu onye nwuru na ime abali putara taata bu Wednesday ka oyachara oya prostate cancer.

Na okwu ya ka ulo ọlụ ministry ogogo etiti na ahu maka aka nka onatarachi, njem nleru anya nakwa omenala sitere na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ọhaneze kowa ntinye oke Pete Edochie na ngalaba ejije ala anyi dika nke ana agaghi echefunata na ndu.

Na nke ya ka aka na achi Anambra State bu Gov Charles Chukwuma Soludo sitere na ozi eze ode akwukwo mgbasa ozi ya na okwa Chief Press Secretary bu Christian Aburime weputara na Awka taata kowa nwa amadi a dika ezi nwa afo Anambra State ji eme onu ma buru onye zoro ukwu dimkpa na ndu ya nakwa nke otutu ndi mmadu.

Na aka nke ozo ka Gov Peter Ndubuisi Mbah na achi Enugu State sitere na ozi nke ya kwuputa iru uju ya nyere onwu a, ma kowa ya dika oke ihe funariri ala anyi.

Ndi ozo sitere na ngalaba nturu ndu kwuputagoro obi mgbawa ha nyere onwu a taata gunyere: nwaanyi na eme ihe nkiri onyonyo bu Uche Jombo, onye ama ama na ime nkenke ihe onyonyo ikpa ndi mmadu obi uto bu Chukwuemeka Ejekwu amakariri dika Investor Sabinus, onye egwu bu DJ Kaywise nakwa otutu ndi ozo.

Ozi meziri ka amata na obu na Enugu ka Pete Edochie bu nwa afo Anambra State nwuru na abali putara taata dika ogbachara afo iri asaa na iteolu na elu uwa a.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited