Egwuregwu Na Africa: Eweputala Aha Mmadu Ise Aga Aroputa Onye Ga Eturu Ugo Nwoke Kacha Agba Ball Na Africa
Written by admin on November 25, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu na achikwa egwuregwu ball ukwu na ala isi oji bu Confederation of African Football CAF eweputala aha mmadu ise nke ikpeazu na ndi ga achupu ya maka onyinye nturu ugo nwoke asompi egwuregwu kachasi mee nke oma na afo a na udi akporo 2026 Men’s Player of the Year Award.
Nke a putara ihe taata bu Wednesday dika esitere na mmadu iri aroputara na mbu weputa mmadu ise a ana atu anya na yabu nturu ugo.
Habu mmadu ise aroputara gunyere: Achraf Hakimi sitere mba Morocco, Sadio Mane nke mba Senegal, Brahim Diaz sitekwuru mba Morocco, Pape Gueye nke mba Senegal nakwa Ismael Saibari sitere mba Morocco.
Ozi meziri ka amata na obu na ubochi Wednesday nke izu uka ozo bu abali abuo nke onwa December afo a bu 2026 ka aga anoro na mmeme 2026 CAF Awards Ceremony ga ewere onodu na Lagos State nke ala anyi kwuputa onye nwetara mmeri na ime habu mmadu ise maka onyinye nturu ugo a.
