Otu Usoro Ego Mba Uwa Eyiela Egwu Umu Afo Nigeria Iga Na Iru Danye Na Ajo Onodu Akuluba

Written by on July 9, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu usoro ego mba uwa bu International Monetary Fund IMF amala okwa si na iri elu oji nke ngala onu ego ana ere akuru ngwa ndi ahu di oke mkpa nyere ndi mmadu na ala anyi bu Nigeria ga agakwa na iru kwanyega umu afo obodo a na ajo onodu ubiam nke ihe isi ike akuluba na agbanyeghi nkutetu ume ndu ana enweta na onodu akuluba ala anyi a.

Nke a na abiakwu dika yabu IMF gara na iru na amuma ya sina akuluba ala anyi ga anoro na agbata afo a bu 2026 ruo 2027 kute ume ndu site na per cent ano na otu uma gbago per cent ano na uma ato.

Na ozi otu usoroego mba uwa a weputara unya bu Wednesday maka onwa a okporo July 2026 World Economic Outlook Update ka okowara na akuluba mba uwa ga adala azu na ime afo a site na per cent ato na uma ise onona na agbata afo 2024 nakwa 2025 banye per cent ato na uma nkiti.

Nke a ka IMF kowara na obu kwere maka ogbaghara mpaghara Middle East nakwa onodu nka na uzu ogbara Igbo ghari amara dika Artificial Intelligence AI.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited