Ochichi Enugu State Anapula Ufodu Ndi Eze Odinala Nakwa Ndi Presidents-General Okwa Ochichi Ha

Written by on July 17, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

 

Ochichi Enugu State dina aka Gov Peter Ndubuisi Mbah achituola ndi eze odinala ato nakwa ndi Presidents-General ano sitechara Ezeagu LGA nke State a na oche eze nakwa okwa ochichi ha kwere maka ebubo agwa ojo.

Na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Thursday na isi obodo Enugu ka Commissioner Stae a na ahu maka echimechi bu Dr Charles Egumgbe nyere aha habu ndi eze odinala ato anapugoduru oche eze ha na udi nwa bekee kporo suspension dika: Igwe C. Ozoigbokwe nke obodo Umuaji, Imezi Owa Autonomous Community, Igwe Leo Nechi nke obodo Imezi Owa Autonomous Community nakwa Igwe Benedict Adinde nke Umuagba Autonomous Community.

Na ozi a rutere ndi nta akuko aka site na aka onye mmekorita ohaneze nyere yabu ulo olu ministry echimechi State a bu mazi Emeka Nebeife ka Dr Egumgbe noro kowa ndi nke Presidents-General anapuru okwa ochichi ha dika; Chief Samson Ike na elekota obodo Umuagba Owa, Chief Remigus Ozoanya nke obodo Ezema Owa, Chief Peter Igwebuike nke Imezi Owa nakwa Chief Lazarus Ejim na elekota obodo Ogwumike Owa.

Yabu Commissioner kowara na ndi a agbara ugbonwamkpi bagidere agwa megidere ezi onodu nchekwa obodo ha bukwanu agwa ojo ona akpoghi aha.

Omeziri ka amata na ugbonwamkpi a amalitegorii idi ire kemgbe nwanne unya bu Wednesday abali iri na ise nke onwa a bu July afo 2026.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited