Ideghi Mmiri: NEMA Enwela Mgbaru Iru Megide Odachi Ideghi Mmiri Na Enugu, Ebonyi
Written by admin on October 14, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ulo olu na ahu maka onodu gbata gbata na Nigeria bu National Emergency Management Agency NEMA ekwuputala onodu echeta ebewa ideghi mmiri ahu biara na onwa September afo a bu 2026 dosara umu afo Enugu nakwa Ebonyi State.
Ulo olu NEMA na nkowa ya mere ka amata na yabu ndeghi mmiri emego otutu ndi oru ugbo na Enugu nakwa Ebonyi state buru okpa aku eriri site n’ikpokoro ihe nille ha koro n’ugbo ma chupu ha na ebe obibi ha digasi ichiche.
Ha gakwara n’iru mee ka amata na yabu ideghi mmiri gburu opekata mpe mmadu abuo na Enugu State, dika onapuru ezinaulo kariri otu nari, iri ato na ano ebe obibi ha na Enugu nakwa Ebonyi State, bukwanu ndi ana akowa n’obuzi n’ulo uka nakwa ulo akwukwo ka ha na arahuzi ka odi ugbu a na states ndi ahu.
N’ikpazu oge ha na akpoku government maka oso enyemaka ka ha guputagasiri ufodu mpaghara ndi ahu yabu ide mmiri kachasi wee bie aka ojoo na state ndi ahu dika; Okpanku nakwa Mpu dicha na Aninri local government area na Enugu state tinyekwara Ivo local government area n’Ebonyi state nakwa otutu ebe ndi ozo.

