Ubochi Mba Uwa Maka Ndi Nkuzi: Gov Otti Enyefela Ndi Nkuzi Abia State Onyinye Nnukwu Ego Ekene

Written by on October 6, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Aka na achi Abia State bu Gov Alex Otti ekwuputala onyinye ego ekene di otu ijeri Naira yabu; 1 Billion Naira gaara ndi nkuzi enwere na State ahu ma nyekwa iwu ikwuzu habu ndi nkuzi ugwo check-off dues nakwa nke ugwo onwa eji ha.

Na oge ona ekwuputa onyinye ego ekene a okporo Teacher’s Appreciation Fund unya bu Monday na ogige Michael Okpara Event Centre dina Umuahia na mmeme ubọchị mba uwa weputara maka ndi nkuzi nke afo a akporo 2026 World Teachers Day Celebration ka Gov Otti nyere ntuzi aka gaara onye mgbako izugbe State ahu na okwa Accountant General ka okesa yabu ego na udi oke nhatanha gaara ndi nkuzi niile enwere na State ahu.

Na ihe banyere oke ego check-off dues habu ndi nkuzi ka yabu aka na achi Abia State nyere iwu gaara nwa amadi ahu ji okwa Accountant General ka ohuna akwuchara ha na ime abali asaa ka odi ugbu a gaara ndi nkuzi niile enwere na State ahu.

Ogara na iru nye iwu ka akwuzuo ndi nkuzi niile eji ugwo, kwere maka ihe banyere nnyocha emere ha, ugwo onwa ndi ahu eji ha tupu onwa a bu October abia na isi njedebe.

Na ihe banyere mbugo na ogogo nke 2021 and 2022 Teachers Promotions na eko achicha na State ahu ka Gov Otti nyere ntuzi aka gaara ulo olu Abia State Universal Basic Education Board ASUBEB ka oluko olu nyere onye isi ndi olu oyibo State ahu ma weputara ya onodu maka nkwado ya, dika onyere ntuzi aka ka emecha ihe ndi a tupu onwa a abia na njedebe.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited