Anwuchila Ufodu Ndi Ntiza Na Ori Akuru Ngwa Ohaneze Na Enugu State
Written by admin on October 6, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State akpatala mmadu ise ana ebo ebubo na agwa ekperima ntisa nakwa ori akuru ngwa ọhaneze ndi gunyere: oku ikuku anyanwu solar street light, ihe mgbama nchikwa njem okporo uzo bu road traffic signs nakwa akuru ngwa ulo olu mmiri nke Enugu State Water Corporation.
Na ozi onyefere ndi nta akuko ma buru nke rutere ngalaba akuko uwa anyi taata bu Tuesday ka onye mmekorita ohaneze nyere habu ndi uwe ojii na State a bu SP Daniel Ndukwe mere ka amata na obu na olu ndi uwe ojii a rugasiri ugboro ato na ufodu mpaghara State a ka anoro nwuchiko ndi a ana enyoenyo.
SP Ndukwe kowara na mmadu abuo na ime ha nke gunyere: Wisdom Nuhu nakwa Moses Jonathan ka anwuchikoro na mpaghara ahia New Artisan dina isi obodo Enugu ebe hana acho irefu oku solar street light ha zuru na ori na ogige Graceland Estate dina Independence Layout nke isi obodo State a.
Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO kowaziri na ndi uwe ojii sitere mpaghara Abakaliki Road Division nwuchikoro onye nke enyere aha ya dika Chukwudi Nwigbo maka ntisa na ori akuru ngwa Road Traffic Signs na yabu okporo uzo sitere isi obodo State a gawa Abakaliki.
Na aka nke ozo ka aka kpatara mmadu abuo gunyere: Zubairu Haman Pedimso nakwa Mohammed Adamu ebe hana acho itisa ma zuo ori akuru ngwa mmiri ulo olu Enugu State Water Corporation.
Na ikpeazu ka SP Ndukwe kowara na akpugago mmadu ise a ana enyoenyo na ulo ikpe, ebe ulo ikpe nyere iwu ka akpochie ha na ulo nga Correctional Centre ganye oge ozo aga enwe ikpe ha.

