Nghotahe Na Etiti Soludo Nakwa Obi: Otu Mgbasa Ozi Peter Obi Enyela Nzaghachi Megide Soludo

Written by on October 6, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu mgbasa ozi nyere nwa amadi ahu ji okoloto otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC azo okwa onye isi ala na afo 2027 bu mazi Peter Obi azaghachila ochichi Gov Charles Chukwuma Soludo na achi Anambra State maka okwu okwuru unya bu Monday megide yabu Peter Obi.

Ozi mere ka amata na ochichi Anambra State noro unya kowa mazi Peter Obi dika onye mmegide nyere otu ndorondoro All Progressives Grand Alliance APGA ositere na ya nweta okwa Governor State ahu na oge gara aga, ebe oyoro ohaneze ndi Anambra ka ha gharakwa itunyere nwa amadi a nakwa otu ndorondoro ya akwukwo vote na ntule aka ochichi afo 2027.

Ka osiladi, na nzaghachi megide nke a taata bu Tuesday ka otu Peter Obi Media Reach sitere ozi onye ndumodu puru iche nyere Peter Obi na ihe metutara mgbasa ozi ma burukwa onu na ekwuru otu a bu mazi Idris Zekeri Jnr nyefere ndi nta akuko mee ka amata ilu ndi Igbo turu sina “anaghi adi abuo ayi ara” dika osiri mmetuta okwu ojo ochichi Gov Soludo megide Peter Obi.

Otu a kowara na obu igba nkiti ka ohoro iji ghara isite na nzaghachi ebunye ochichi Soludo okpu eze na erubeghi ya.

Mazi Zekeri Jnr katoro ihe okowara sina Gov Soludo rapuru itinye oge, akuluba nakwa ihe oma ndi ozo maka ezi ochichi nyere ndi Anambra State, kama na oji akuluba State ahu nakwa oge ha ana na iyi sina ona achughari mazi Peter Obi.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited