President Tinubu Adila Njikere Isite Njem Mba Ofesi Ya Na Mpaghara Europe Naghachite Nigeria
Written by admin on September 27, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu adila njikere inoro nwanne echi bu Tuesday abali iri abuo na iteolu nke onwa a bu September naghachite ala anyi na njem ezum ike mba ofesi ahu omere kemgbe.
Iga echeta na President Tinubu noro na abali iri ato nke onwa August gara aga rapu ala anyi gawa njem ezum ike izu uka ano ya na mba ndi dina mpaghara Europe.
Ka osiladi, na ozi ndi nta akuko nwetara taata bu uka site na obi onye isi ala nke ahu amara dika presidency ka emere ka amata na obu Lagos ka President Tinubu ga awuchi nwanne echi.
Ozi a kowakwara na yabu onye isi ala ga anoro na Lagos merube mmeme ubọchị nnwere onwe ala anyi ga ewere onodu na ubọchị Wednesday na abianu bu abali mbu nke onwa October afo a.
Ozi a gara na iru kowa na Tinubu ga anoro na ngwucha izu uka a site Lagos naghachite Abuja, imalite olu ya.

