Akpoputala Osisa Ntule Aka Ochichi Okpuru Ochichi Ime Obodo Were Onodu Na Enugu State

Written by on September 27, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu ndorondoro All Progressives Congress APC enwetala nturu ugo na okwa niile nyere ntule aka okpuru ochichi ime obodo ahu were onodu unya bu Saturday na Enugu State.

Na mkpoputa osisa ntule aka ochichi a taata bu uka na isi obodo Enugu ka onye isi oche ulo olu Enugu State Independent Electoral Commission ENSIEC bu Prof Christian Ngwu mere ka amata na APC nwetachara mmeri na okwa ndi isi oche okpuru ochichi ime obodo iri na asaa nakwa nke ndi Councillors di nari abuo na iri isii enwere na State a na yabu local govt elections.

Okowara na obu otu ndorondoro ochichi di asaa sonyere na ntule aka ochichi a.

Habu ndi isi oche okpuru ochichi iri na asaa jicha okoloto otu ndorondoro APC turu ugo gunyere: Ugochukwu Nwanjoku maka Aninri LGA, Joseph Uchenna Okolo maka Awgu, Pastor Beloved Dan Anike maka enugu East, Dr Ibenaku Onoh maka Enugu North, ebe Caleb Ani turu ugo maka Enugu South, Dr Vitalis Ndu enweta mmeri maka Ezeagu, dika Martins Amadi turu ugo na Igbo-Etiti, Dr Chris Onyenwuchi enweta Igbo-Eze North, Ugo Ferdinand Ukwueze emerie maka Igbo-Eze South nakwa Brenda Ani nwetara mmeri maka Isi-Uzo LGA.

Ndị ozo gunyere: Michael Ogbuekwe maka Nkanu East, John Ogbodo maka Nkanu West, Jude Asogwa maka Nsukka, ebe Greg Anyaegbunam nwetara mmeri maka Oji River, Innocent Ezeoha maka Udenu, dika Hyginus Agu meriri na Udi nakwazi Chidiebere Ezu turu ugo na Uzo-Uwani LGA.

Onye nta akuko anyi bu Chukwuma Philips wetara ozi na ulo olu ENSIEC mechara noro taata oge akpoputachara osisa ntule aka ochichi a nyefe ndi a aroputara asambodo nturu ugo ha akporo Certificates of Return.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited