NCDC Enyela Nkowa Ihe Ochoputara Banyere Ndi Enyoro Enyo Ohuru Na Ha Butere Oya Ebola Na Mgbago Ugwu Nigeria
Written by admin on November 1, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo olu Nigeria Centre for Disease Control and Prevention NCDC emela ka amata na emego nnyocha nke oma gaara mmadu abuo anoro unya bu Saturday nyoenyo na ha butere oya Ebola na mgbago ugwu North East kpomkwem na Adamawa State, mana nnyocha aruike laboratory tests abuo emere ha gosiri na ha ebughi yabu oya.
NCDC noro na ozi putara ihe na ututu taata bu uka kowa na nke a na egosi na onweghi onye ozo achoputagoro butere oya a na ala anyi ma ewezuga onye nke ahu anoro na mbu choputa ya na aru na Abuja, bukwanu onye ebupugoro buga mba Switzerland ositere.
Na ozi onye Director General ulo olu a bu Dr Jide Idris nyefere ndi nta akuko unya bu Saturday ka okowara na obu na Yola bu isi obodo Adamawa State ka anoro huta mmadu abuo ahu enyoro enyo maka ihe mgbama oya Ebola na aru ha, ma mee ngwangwa wezuga ha na usoo, buzi ebe anoro mee ha nnyocha aruike nke oma ma choputa na obughi oya Ebola ka ha butere.
Dr Idris toro Commissioner na ahu maka aruike na Adamawa State nakwa ndi olu ya maka ngwangwa ha mere banyere onodu a oge ahutara ndi ahu enyoro enyo maka yabu oya.
