Sen Tinubu Agbapela Usoro Nkwalite Nakwa Nke Achum Nta Nkwado Na Mpaghara South East
Written by admin on November 1, 2026
by Treasure Moses
Nwunye President Bola Ahmed Tinubu bu Sen Oluremi Tinubu agbapela usoro mmalite nkwalite umunwaanyi Igbo akporo South East Women Mega Empowerment Programme nakwa nke achum nta nkwado All Progressives Congress Women Mobilization Campaign, dika okpokuru ọhaneze umu afo Nigeria ka ha nwe olile nyere odi na iru ka mma nke akuluba ala anyi.
Na okwu ya na ogbako mmeme a were onodu unya bu Saturday na ogige Okpara Square dina isi obodo Enugu ka Sen Tinubu kowara na atumatu ndi ahụ di ya ji na aka nyere nhazighari akuluba amalitego isu uzo nke agam na iru nyere umu afo Nigeria.
Okwuputara atumatu onyinye ego azum ahia di nari puku Naira abuo gaara umunwaanyi di nari asaa na iri ise na State a nakwa usoro nkwalite gaara ndi okenye rugoro afo iri isii na ise di nari abuo na iri ise, ma buru enyemaka ga abiacha na onwa December afo a bu 2026.
Na nke ya ka Gov Peter Ndubuisi Mbah toro yabu nwunye onye isi ala maka ubara enyemaka ya gaara nari kwuru nari umunwaanyi sitere State a nakwa mpaghara South East, ebe oyoro habu umunwaanyi ka ha kwado President Tinubu.
Ndi ozo kwuru okwu na ogbako a gunyere: aka na achi Imo State bu Gov Hope Uzodimma, ogbo ya nke Ebonyi State bu Gov Francis Ogbonna Nwifuru, osote aka na achi Anambra State bu Dr Onyekachukwu Ibezim, osote onu na ekwuru ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti ala anyi bu Rt Hon Benjamin Kalu nakwa otutu ndi ozo.
Onye nta akuko anyi na obi govt Enugu bu Treasure Moses wetara ozi na akuru ngwa nkwalite nwunye onye isi ala kesara habu umunwaanyi na ogbako a gunyere: igwe eji akwa akwa bu sewing machines, igwe oku electricity generating sets, igwe eji ahazi nri bu food processors nakwa igwe popcorn machines.
