Ndi Oji Egbe Eri Awakpola Ma Kpa Ike Ojo Na Isi Ulo Olu Ndi Uwe Ojii Na Abia State
Written by admin on October 18, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndị uwe ojii mmadụ abuo anorola na ubochi Saturday bu abali iri na asaa nke onwa October afo 2026 zute onwu ike ha, ebe mmadu ato ndi ozo nwetara ihe mmeru aru oge ndi oji egbe eri wakporo isi ulo olu Police Station dina Uratta nke Aba na Abia State.
Na okwu ya oge yana Gov Alex Otti megara njem nleta na yabu isi ulo olu ndi uwe ojii awakporo ka Commissioner ndi uwe ojii ala anyi na State ahu bu CP Wilfred Afolabi kowara na mmadu ato nke ahu nwetara ihe mmeru aru gunyere ndi uwe ojii mmadụ abuo na otu onye nkiti, ebe ebugagoro ha ulo ogwu maka ogwugwo.
CP Afolabi gwara ndi nta akuko na ndi oji egbe eri ahu gbara oku na ufodu mpaghara yabu Uratta Police Station, gunyere otu ugboala Hilux van nakwa ugboala ndi ozo.

