Latest Updates
Page: 4
Aka na-achị Anambra Steeti bụ Gov Chukwuma Soludo etiela aka n’obi ya sị na ya ahụbeghi onye nwere ikikere ịmeri ya na ntụliaka aga eji họpụta gọvanọ Anambra Steeti ọhụrụ n’abalị asatọ nke ọnwa Novemba n’afọ a. Gov Soludo kwuru na e nwere nkwekọrịta zuru oke n’etiti ụmụ afọ Anambra Steeti bụ ndị kwuru na […]
Ulo ikpe Magistrates Court ji Bende LGA nke Abia State mere onodu enyela iwu ka akpuga onye eze odinala na elekota obodo Okai Item bu HRH Eze James Ogbonna na ulo nga Nigerian Correctional Centre dina Umuahia bu isi obodo State ahu. Yabu ulo ikpe nyekwara iwu ka akpugakwuo mmadu abuo ndi ozo ana ebo […]
Achikobala ogbako ntule aka ochichi ejiri roputa eze odinala ohuru obodo Amana Autonomous Community dina Ezza South LGA nke Ebonyi State bukwanu ebe anoro roputa Chief Clement Nweke Nwoga dika onye eze odinala ohuru yabu obodo. Nke a putara ihe na ubochi Saturday na yabu ogbako ntule aka ochichi dotara puku kwuru puku ndi obodo […]
Mba Sudan ekwupụtala nkwụsị ha kwụsịrị isi na mba Kenya bụ ndị hana ha nwere oke ala were bubata akọrọ ngwa ọbụla n’obodo ha. Ha kwuru na bụ iji gosipụta iwe n’ebe otu ahụ na ama gọọmenti ha aka n’ihu bụ otu akpọrọ Rapid Support Response bụ ndị hana ụsụụ ndị agha mba Sudan lugoro […]
Otu onye uwe ojii nọ nọkwa inspector e nyere aha ya dịka inspector Ajele Oloyede ka ozi kwuru na ọ nwụọla site na ọnyá egbe ọ gbara onwe ya n’ogige ụlọrụ ceramics company dina Igbesa Ogun State bụ ebe ọ na-arụ ọrụ dịka onye ọrụ nchekwa. Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ọ bụ n’ime […]
Onye nkwasu igbudu nyere otu egwuregwu Super Eagles ala anyị bụ Ọla Aina e sonyerela ogbo ya ndị ọzọ were tinye ọnụ n’okwu banyere ndị kacha mara nke ekwe na-akụ na iku egwu awantilo akpọrọ Afrobeats n’ala anyị gbaa gburugburu. Ya bụ nwa n’agbara otu egwuregwu Nottingham forest ka a jụrụ ya kpọkene aha mmadụ […]
Opekatampe mmadụ iri ise n’otu nwụnyuru anya piii ebe ndị kariri otu narị merụrụ nnukwu ahụ n’oge ọkụ ọgbụgba tasuru na ọgbakọ abalị akpọrọ nightclub n’isi ụtụtụ taa bụ ụka n’obodo Kocani nke dina mba North Macedonia. Minista n’ahụ maka ihe na-eme na mba ahụ bụ Pance Toskovski kwuru na ọ bụ otu akọrọ ngwa […]
Onye ji ọkwa osote odeakwụkwọ nyere otu pentecostal fellowship of Nigeria nke mpaghara South East zone bụ Rev Blessed Amalambu akatola ya n’ebe ọ dị oke elu bụ mmachi ahụ gọọmenti Anambra Steeti nọrọ na ọ dị nso a machie igbasa ozi ọma osebulu ụwa n’okporo ụzọ ọhaneze yana ahịa ndị enwegasiri na Anambra Steeti. […]
Ochichi etiti enyela nkwado irunye ogige nsichaputa mmanu modular refinery na Abia state. Obu aka n’ achi Abia state bu governor Alex Otti mere ka ozi oma puta ihe n’ oge ona amalite olu okporo uzo ahu di 11.1 kilometers ma buru nke jikoro obehie-Umudobia nakwa Owaza nke di n’ okpuru ochichi ukwa west LGA […]