Nigeria Nakwa Mba Ethiopia Ebinyela Aka Nkwekorita Mgbanwerita Ndi Aturu Nga

Written by on June 11, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ochichi etiti Nigeria nakwa nke mba Ethiopia ebinyela aka nkwekorita nnyefe ndi ahu amagoro ikpe na udi akporo Transfer of Sentenced Persons Agreement na etiti habu mba abuo ma kwekoritakwa imalite ozugbo tinye nke a na olu dika osiri di na iwu ala anyi na nke Ethiopia gunyere nke mba uwa.

Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi taata bu Thursday ka onye enyemaka puru iche nyere Minister na ahu maka odimma mba ofesi na ihe metutara nzikorita ozi nakwa owa ozi ogbaru ohuru bu Dr. Magnus Eze mere ka amata na obu unya bu Wednesday ka enwere mbinye aka nkwekorita a na Addis Ababa bu isi obodo mba Ethiopia ma buru nke sitere na ezi mbo yabu Minister odimma mba ofesi bu Amb. Bianca Odumegwu-Ojukwu nakwa ogbo ya nke mba Ethiopia bu Gideon Timothewos.

Dr. Eze kowara na okaiwu izugbe ala anyi na okwa Attorney General ma burukwa Minister ikpe nkwumoto bu Lateef Fagbemi SAN binyere aka na aha Nigeria, ebe ogbo ya nke mba Ethiopia bu Hanna Arayaselassie binyere aka na aha mba ya.

Na okwu ya ka Amb. Odumegwu-Ojukwu kwuputara ekene President Bola Ahmed Tinubu nakwa nke ọhaneze umu afo ala anyi, ma kowa nkwekorita a dika nke gbasoro inwe obi mmadu, ikpe nkwumoto nakwa mmekorita mba uwa.

Amb. Odumegwu-Ojukwu kwuputara na nke a enyego ohere na enwere ike site na nkwekorita a zidata nwa afo ala anyi aturu nga na mba Ethiopia ka obia notopu nga ya na Nigeria, ebe enwere ike iziga nwa afo Ethiopia aturu nga na ala anyi ka oga mba ahu nozuo oge nga ya.

Yabu Minister yoro umu afo ala anyi na emega njem mba ozo ka ha gba mbo na erube isi na iwu mba obuna ha hutara onwe ha mana akpakwa agwa gana ewetara ala anyi a ezi aha.

Na ikpeazu ka Dr. Magnus Eze kowara na ndi ozo sonyere na ogbako mbinye aka nkwekorita a gunyere: onye nnochite anya ala anyi nyere mba Ethiopia ma burukwa Permanent Representative nyere otu jikoro ala isi oji akporo African Union bu Amb. Nasir Aminu, onye nochitere anya ulo nga Nigeria Correctional Service nakwa onye Commissioner General nke Ethiopian Federal Prison Commission, gunyere ndi ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited