Enyela Nkowa Na Ozuzu Oke Banyere Nkusu Ohuru Emere Na Ulo Akwukwo Dina Ebonyi State
Written by admin on June 11, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye Provost, ulo akwukwo Ebonyi State College of Health Science and Technology dina Ngbo nke Ohaukwu LGA na State ahu bu Princess Chetachi Usulor enyela nkowa na ozuzu oke sina obu mmadu iteolu na ime umuakwukwo ahu nwetara ihe mmeru aru oge ndi tika zogbuo wakporo ebe obibi umuakwukwo ndi nwaanyi yabu ulo akwukwo nwanne unya bu Tuesday.
Na okwu ya unya bu Wednesday ka Princess Usulor kowara na ndi osochi egbu ahu zukoro ekwenti, ego, mpempe akwukwo ndoro ego bu ATM Card nakwa ihe ndi ozo habu umuakwukwo ji biri.
Nwaanyi a noro na oge ona akowa na omere ngwangwa kpoturu ndi nchekwa oge onwetara ozi banyere yabu mwakpo kwuputa na, enweghi mgbidi okirikiri na nnukwute ala yabu ulo akwukwo sona ihe butere nkusu a.
Okwuputaziri na ihe mmeru aru umuakwukwo ahu bu kwere maka oge ha sitere na ulo elu nwere otu mkpokwasa ha bina ya mapu na ike igba oso ndu ha megide yabu mwakpo.
Na nke ya ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State ahu bu SP Joshua Ukandu kowara na nkusu a bu eziokwu kama na ezigala ndi uwe ojii aka kara aka chi oku di egwu achiso inwuchiko habu ndi tika zogbuo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.