Gov Soludo Akpolitela Ndi Nchikwa Ohuru Nke Mahadum Anambra State

Written by on June 12, 2026

by Chidimma Kama

Aka na achi Anambra State bu Gov Charles Chukwuma Soludo ekwunwuola mkpebi ochichi ya iweta ezi mgbanwe ka mma nyere onodu mmuta na mpaghara niile dina State ahu.

Gov Soludo mere ka nke a puta ihe na obi govt State ahu dina Awka oge ona edu ha na iyi olu bu otu nchikwa akporo Governing Council nke Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University dina Uli na Ihiala LGA.

Yabu aka na achi Anambra State yoro ndi a oduru na iyi olu ka ha ruo olu maka ibugo mahadum ahu na isi ugbo opuru iche nke mmuta na ala anyi a bu Nigeria.

Na nke ya ka onye isi oche ma burukwa Pro-Chancellor ohuru yabu mahadum bu Prof. Peter Onwualu kenere Gov Soludo maka mkpolite na okwa a ma kwe nkwa ezi olu ihuna Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University bu okaibe na mahadum niile enwere na obodo a.

Onye nta akuko anyi bu Chukwuma Philips wetara ozi na ndi ozo sona otu nchikwa a eduru na iyi olu gunyere: Prof. Kate Omenugha, Prof. A.C. Nweke, Prof. Obiora Ejiofor, HRH Igwe Chris Chidiume, Prof. Josephat Ogbuagu, Chief Christopher Ndubuisi nakwa ndi ozo, ebe Gov Soludo noro na mmeme a nyefe onyinye ugboala 18-Seater bus abuo gaara yabu mahadum.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited