Ndi Agha, Ndi Uwe Ojii Nakwa Ndi Isi Ekwe Onwu Asuola Onwe Ha Akwu Na Ogun State

Written by on June 9, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi agha ala anyi sitere usuu ndi agha 35 Artillery Brigade of the Nigerian Army dina Abeokuta bu isi obodo Ogun State esitela na njiko aka na olu hana ndi uwe ojii tisa atumatu ojo ndi oji egbe eri jiri choo itoro nwa afo mba China na imime obodo Magbon Village na mpaghara Mowe nke Obafemi-Awode LGA na State ahu.

Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Tuesday na Abeokuta ka osote onye Director na ahu maka mmekorita ohaneze nyere habu ndi agha bu Maj Idereghi Samuel Akari mere ka amata na ndi oji egbe eri ahu nwere nnukwute nkwakorita mgbo nyere habu ndi agha nakwa ndi uwe ojii mana ndi nchekwa ala anyi a mechara tisa yabu atumatu ojo nke ntori.

Okwuputara na ndi agha a gbagburu otu onye na ime habu ndi isi ekwe onwu ma buru nke kpatara na ndi ozo foro afo riri mbombo oso, kama na ndi ahu riri mbombo oso gara toro mmadu ise dika ihe mgbochi megide nnukwute oku ndi nchekwa chi eso ha.

Maj Akari koro ndi nta akuko na ndi oluo otunye isi ahu mechara gbuo mmadu ano na ime mmadu ise ahu ha toro na ike, ebe otu onye agha soldier zutere onwu ike ya oge ahu hana enwe nkwakorita mgbo, dika onye agha ozo nakwa ndi uwe ojii mmadu abuo nwetara ihe mmeru aru sitere na mgbo egbe ndi osochi egbu ahu.

Yabu onu na ekwuru ndi agha kwuputara na ebugago ozu onye agha ahu nakwa mmadu ano egburu na ike na oba nchekwa ozu dina ulo ogwu Sagamu General Hospital, ebe ndi nke ahu nwetara ihe mmeru aru nona ebe hana anata ogwugwo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited