Peter Obi Akatola Ajo Onodu Nkawanye Njo Ego Mbite Na Ochichi Tinubu

Written by on June 9, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Nwa amadi ahu ji okoloto otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC azo okwa onye isi ala Nigeria na ntule aka ochichi afo 2027 bu mazi Peter Obi akatola ochichi President Bola Ahmed Tinubu na ihe okowara dika oke ego mbite nakwa adighi ike enye ezi nkowa banyere onodu ego ala anyi.

Na ozi oweputara ndi nta akuko taata bu Tuesday site na owa ozi mmekorita ohaneze ka Peter Obi kowara na ego ala anyi ji na ugwo ka odi ugbu a di nari tari Naira abuo yabu; 2 Hundred Trillion Naira, ma kowa ya dika nke sitere na amaghi achi ochichi di ugbu a.

Yabu onye jiburu okwa Governor Anambra State kwuputara na nke a gosiri na ochichi President Tinubu noro naani na afo ato onogoro bite ego kariri otu nari tari Naira nke putara, over 1 Hundred Trillion Naira, ma buru ihe okowara dika okaibe, na udi ka njo ma elegara anya na ego di 49 Trillion Naira, ochichi nke Late President Muhammadu Buhari bitere na ime afo asato onoro.

Obi mere ka amata na onodu a bu mgbaama gosiri akwubaghi aka oto na ochichi dika osiri metuta inye nkowa udi okporo Accountability and Transparency na ichikwa ego mbite.

Yabu onye ji okoloto otu ndorondoro Labour Party zoo okwa onye isi ala na afo 2023 kwuputara na onodu a kwesiri nnyocha nakwa nkowa site na ndi odi na aka.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited