Mmadụ Isii Anwụọla Site Na Nkusu Ndị Osochi Egbu Mere Ohuru Na Sokoto State
Written by admin on July 6, 2026
by Chika Nwazu
Opekatampe mmadụ isii nwụnyuru anya piii n’oge ndị oso chi egbu akpọrọ Bandits wakporo obodo Danchadi dị na Bodinga Local Government Area nke Sokoto State ma chụpụkwa imirikiti ndị bi na okirikiri ahụ n’ebe obibi ha.
Mwakpo ohuru a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbapụ n’ụlọ ha, ebe ndị ahụ afọ tara mmiri bukọkwara ihe karịrị ehi dị otu puku were banye n’ime ọhịa.
Akụkọ banyere mwakpo a ka emere ka ọ pụta ihe site n’aka onye isi obodo Danchadi bụ Alhaji Lirwanu Mafaran Kuwarun Sarkin Musulmi, zigara Onye Isi Oche okpuru ọchịchị ime obodo Bodinga.
Otu nnukwu onye eze ọdịnala sitere mpaghara ahụ mere ka amata na ya nyefere ụlọọrụ ndị nchekwa na-arụ ọrụ n’ebe ahụ akwụkwọ gbasara mwakpo ahụ.
Ebe mbọ niile ndị nta akụkọ gbara iji kpọtụrụ onye mmekọrịta ọhaneze nyere Ndị Uwe Ojii Sokoto State bụ DSP Ahmad Rufa’i, amịtaghizi mkpụrụ ọma ọbụla kworo na ọ zaghị oku niile akpọrọ na ekwentị ya ma ọ bụ kpọghachite oku ahụ.
