Ochichi Etiti Akpokuola Umu Afo Nigeria Ahu Ka Nona Mba South Africa Ka Ha Sonyere Na Ohere Oma Oji Akponata Ha

Written by on July 6, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

 

 

 

Govt etiti ala anyi ekwuputala mmetuta ya megide onwu umu afo Nigeria mmadu abuo enyere aha ha dika Musa Yunana Joe nakwa Charles Iroegbu nwuru site na ngaghari iwe nakwa nkusu umu afo mba South Africa na eme emegide ndi obia bina mba ahu, dika ochichi etiti kpokuziri ochichi mba ahu ka ome ngwangwa malite nnyocha maka ikpe nkwumoto gaara ndi a egburu na ike.

Ochichi etiti ala anyi gara na iru mee ka amata agam na iru olu ikponata umu afo ala anyi ahu nona South Africa nwere mmasi inaghachite Nigeria.

Na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze taata bu Monday ka Minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb. Bianca Odumegwu-Ojukwu mere ka amata na aga anoro echi bu Tuesday, abali asaa nke onwa a bu July kponata umu afo ala anyi ozo site na Johannesburg nke South Africa, ebe nkponata nke ikpeazu habu umu afo ala anyi ga ewere onodu na ubochi Friday bu abali iri nke onwa a.

Ochichi etiti sitere na ozi a yoo habu umu afo Nigeria nona mba South Africa ka ha jiri ohere oma a mara ihe ha mere sonyere ibe ha nata, ma elegara anya na ndu ka ihe eji azo ya.

Govt etiti gakwara na iru kwunwuo mkpebi ya nyere nchekwa nakwa odimma umu afo ala anyi niile bina mba ofesi.

Iga echetazi, na ochichi etiti ala anyi adila na mbu ugboro ano na otu na otu na odi nso a kponata umu afo ala anyi nona mba South Africa, ebe President Bola Ahmed Tinubu gbatikwuru oge enyedebere maka ikponata habu umu afo Nigeria ka osite na abali iri ato nke onwa June gara aga okara ikwusi ruo na nke a ga abu na abali iri nke onwa a bu July.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited